Ebe foto si, Ovie Omo-Agege/Facebook

Otu ụlọikpe ukwu dị na Warri, Delta State, achụpụla Ovie Omo-Agege iso zọọ ọkwa oche sineti maka ịnọchite anya ndị mpaghara Delta Central, n'ụlọ omeiwu ukwu nke Nigeria.

Mkpebi a na-abịa ka o ruchabeghi otu ụbọchị ndị ojiegbe wakporo ebe Omo-Agege na ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị ya bụ Nigeria Democratic Congres (NDC) na-eme emume ịchụnta vootu n'Ugheli, ma gbuo ihe ruru mmadụ isii, n'ụbọchị Mọnde

Ọkaikpe Hyeladzira Nganjiwa bụ onye nyere mkpebi a n'ụbọchị Tuzde, nyekwara ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) iwu ka ha kachapụ aha Omo-Agege n'akwụkwọ ndị ga-eso zọọ ntuliaka afọ 2027.

Ụlọikpe ahụ dọkwara Omo-Agege aka na ntị ka ọ kwụsị ịgosipụta onwe ya dịka onye na-azọ ọkwa sineti na pati NDC.

End of content

Ọkaikpe Nganjiwa kwuru na pati NDC erubeghị isi n'iwu ntuliaka Nigeria gbasara onye bụ oye otu pati nwere ike ịzọ ọkwa ọbụla na pati ahụ.

O kwuru na nnyocha gosiri na aha Omo-Agege adịghị n'akwụkwọ rejista nke ndị NDC hafere n'aka ụlọọrụ Inec opekata mpe ụbọchị 21 tupu ha e nwee ntuliaka imeụlọ ha maka ọkwa sineti.

Ọkaikpe ahụ kwukwara na nchọpụta gosikwara na Omo-Agege so zọọ ntuliaka imeụlọ nke ndị pati 'All Progressives Congress (APC) bụ nke e mere n'ụbọchị 18 nke ọnwa May 2026, nke gosiri na ọ bụ onye otu APC n'oge ahụ.

Nganjiwa kwuru na pati NDC egosighi ihe akaebe ọbụla iji kwuo na ha mechara denye aha Omo-Agege n'akwụkwọ rejista ha ma nyefee ya n'aka ụlọọrụ Inec n'ime oge iwu ntuliaka nyere ohere maka ime nke a.

N'ihi ya, ọkaikpe ahụ nyere iwu ka Inec wepụ aha Ovie Omo-Agege dịka onye ga-azọ ọkwa sineti na pati NDC, ma nyekwa iwu ka Inec hazigharịa ntuliaka imeụlọ ọzọ ebe ndị Pati NDC ga-ahọpụta onye ga-azọrọ ha ọkwa sineti na mpaghara Delta Central.

Pati NDC nakwa Omo-Agege ekwubeghị ihe ọbụla gbasara ikpe a ụlọikpe kpebiri n'ụbọchị Tuzde.

Onye bụ Ovie Omo-Agege

Ovie Omo-Agege bụbụ osote onyeisi ụlọ omeiwu sineti Nigeria malite n'afọ 2019 ruo 2023.

N'oge ahụ, ọ bụ onye na-anọchite anya mpaghara 'Delta Central' n'ụlọ sineti Nigeria, ma bụrụkwa onye otu APC.

Chọpụta karịa

Vidio

Njebe Vidio

Isi akụkọ

Etu e si gbuo Umukoro Efemena na ndị ọzọ n'emume ịchụnta vootu ndị NDC na Delta state

Ana m enwe nsogbu ọkụ latrịk, enweghị mmiri n'obi ọchịchị 'Presidential Villa' – Tinubu

Jensen Huang: Etu mkpọghachi nwaamadi a dịka onyeisi Nvidia si metụta ọnụahịa 'shares' ha

Kọwaara m isi akụkọ

Akụkọ akachasị gụọ